Igbo cuisineoPo ua_oyxf_IipWw ata Nn9Geeig cw Jjom
Nri ndị Igbo bụ nri dị iche iche eji mara nke ndị Igbo na ndịda ọwụwa anyanwụ nkeNigeria . Ihe oriri ha agụnyere ụdị nri di iche iche, otu esi esi ha, na ụdị akwụkwọ nri dị iche iche anụ,nakwa mkpụrụosisi ndị mejupụtara nri omenala ha. Nri Igbo, dị ka ọ dị n'omenaala niile, enweela ihe mgbanwe site n' gburugburu ha, mmekọrita ndi agbata obi ha nakwa akụkọ eji mara ha.
E nwere ọtụtụ erimeri eji mara ndị Igbo mana nke kacha pụta ihe ndi igbo na South-East na South-South na-eri bụ Abacha bụ nke a makwaara nke ọma dị ka Salad Africa. Abacha bụ nri na ewu ewu n'ala igbo niile di n'ọdịda anyanwụ nke Nigeria. Ọ bụ site n'akpụ akwọrọ,echere n'anwụ, mmanụ nri,akanwụ,yabasị eberiri eberi,nnu, ose kpọrọ nkụ,isha akwọrọ akwọ,ụtazi ebere ebe, magị na ụgba. E nwere ike iri abacha dika ihe eji ejide agụụ maọbụ nri zuru oke. A na-eji azụ ọkpọọ/asa maọbụ kpọmo wee rie ya (anụ ahụ ehi).
Nri sekpụ ntị na nri ndị igbo bụ ofe ha. Ofe ndị akacha mara bụ ofe Ọha, onugbo, Egwusi na NsalaIsi ihe ndi Igbo bu nri ya. Achịcha ndị a na-adọrọ mmasị bụ Oha, Onugbu, Egwusi na Nsala (white soup) . Ji bụ nri ndi igbo na-erikari , a na-esi ya esi maọbụ sụọ ya asụ were ofe rie ya.
Ihe oriri ndị kacha pụta ihe[mèzi | mèzi mkpụrụ]
- Nri ji na ofe Ọha [1]
- Nri ji na ofe Egwusi
- Nri ji na ofe Nsala
- Nri ji na ofe Onugbu
- Nri ji na ofe Ọkrọ
- Ji Akwukwo nri
- Nkwobi
- Abacha
- Ọkpa
Ebe nsi nweta[mèzi | mèzi mkpụrụ]
- ↑ 22 Foods Nigerians Miss Most While Living Abroad
Njikọ ndị dị n'èzí[mèzi | mèzi mkpụrụ]
- Igbo Foods | A complete list of igbo foods eaten by Igbo People